Colossians 2:18 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ekwela ka onye ọ bụla gụọ gị dị ka onye furu efu nꞌihi na i kweghị iso ya fee ndị mmụọ ozi, dị ka ha si kwuo. Ha pụrụ ikwu na ha hụrụ ọhụ, gwa unu na unu kwesịrị ịhụ ụdị ihe ha hụrụ. Ndị dị otu a na-afụli onwe ha elu nꞌefu, nꞌihi ụdị echiche mmadụ a ha na-eche.
Igbo 2006
Unu ekwela ka onye ọ bula me ihe ọ nāchọ n'ipunara unu ihe unu nāb͕ata n'ọsọ, site n'obi di ume-ala na ikpere ndi-mọ-ozi, nēguzo n'ihe ọ huworo, onye uche nke anu-aru-ya nāfuli elu n'efu,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Unu ekwela ka onye ọbụla nke ọ na-amasị ife ndị mmụọ ozi maọbụ ibi ndụ umeala nke aghụghọ dị nʼime ya, onye na-ekwu ọtụtụ okwu banyere ọhụ ọ hụrụ, si otu a na-afụli onwe ya elu nʼefu nʼihi echiche nke onwe ya, maa unu ikpe ma napụ unu ihe nrite unu.