Colossians 2:20 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ebe ọ bụ na unu sooro Kraịst nwụọ mgbe ọ nwụrụ, ọ bụrụkwa na unu enwerela onwe unu site nꞌiso ụzọ ntụpụta nke ụwa, dị ka ịrụ ezi ọrụ na idebe iwu dị iche iche, gịnị mekwaranụ unu ji na-eso ha ugbu a na-ekwe ka e jiri iwu ha na-atụrụ unu ihe unu ga-eme, na ihe unu na-ekwesịghị ime, dị ka, “Erila nke a,” “Edetụla nke a ire,” “Ebitụla nke a aka?”
Igbo 2006
Ọ buru na unu na Kraist nwukọrọ anwu pua n'ihe-ozizí mbu nke uwa, gini mere, dika agāsi na unu nādi ndu n'uwa, unu nēdo onwe-unu n'okpuru iwu di iche iche enyere,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ebe ọ bụ na unu esorola Kraịst nwụọ nʼebe ozizi na amamihe niile nke na-achị ụwa nọ, gịnị mekwaranụ unu ji ka na-ebi ndụ dị ka a ga-asị na unu bụ nke ụwa, gịnị mere unu ji na-edo onwe unu nʼokpuru iwu ya dị iche?