Colossians 2:23 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụ ezie na iwu ndị a na-adị ka ihe dị mma, nꞌihi na onye na-edebe ha kwesịrị itunyezi uche ya idebe ha, bụrụkwa ihe na-ewetara mmadụ obi umeala na ihe na-enye ahụ anyị ahụhụ, ma o nweghị uru ha bara nꞌihe gbasara inwe mmeri nꞌebe echiche ọjọọ na ọchịchọ ọjọọ mmadụ dị. Ihe iwu a na-eme bụ nanị ime ka mmadụ na-afụli onwe ya elu.
Igbo 2006
Ọ bu ezie na ihe di otú a nwere nke anākpọ amam-ihe n'ikpe ekpere dika madu chọrọ, n'inwe kwa obi di ume-ala, n'ime kwa ka aru hu ahuhu; ma ha abughi ihe di oké ọnu-ahia ma-ọli megide ime ihe ọjọ nke gēju anu-aru afọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼezie, iwu ndị a yiri ihe e ji amamihe guzobe, nʼihi ụzọ o si akwali mmụọ mmadụ nʼife ofufe dị ka ọ chọrọ, na iweda onwe nʼala, na ịta anụ ahụ ahụhụ. Ma ha abaghị uru o bụla iji ha gbochie agụụ ọjọọ nke anụ ahụ.