Colossians 2:5 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na ọ bụ ezie na anọghị m unu nso, ma anọ m nꞌetiti unu nꞌime mmụọ oge nile. Ọ na-atọ m ụtọ nke ukwuu na unu guzosiri ike nꞌokwukwe unu nꞌime Kraịst.
Igbo 2006
N'ihi na ọ bu ezie na anọghm n'etiti unu n'anu-arum, ma anọm n'etiti unu na mọm, nāṅuri, nēle kwa usoro-unu na otú okwukwe unu kwere na Kraist di ike.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ ezie na anọghị m nʼetiti unu nʼanụ ahụ, ma anọ m nʼetiti unu nʼime mmụọ. Ana m aṅụrị ọṅụ ịhụ mkpebi unu na iguzosi ike nʼokwukwe unu nʼime Kraịst.