Colossians 2:7 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Bụrụnụ ndị mgbọrọgwụ ha mibanyere nꞌime ya, ka unu si otu a na-enweta ike unu, na nri unu nꞌime ya. Gbalịanụ ito eto, bụrụnụ ndị dị ike na ndị maara okwu ya. Ka ndụ unu jupụta nꞌọṅụ na ekele nꞌihi ihe nile o meere unu.
Igbo 2006
buru kwa ndi b͕agideworo nkpọrọgwu nime Ya, ndi anēwuli kwa elu dika ulo nime Ya, ndi anēwere kwa okwukwe-unu me ka unu guzosie ike, dika ezíri unu, nēkelebiga ókè.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Bụrụnụ ndị mgbọrọgwụ ha mibanyere nʼime ya, ndị a na-ewuli elu nʼime ya, ndị dị ike nʼime okwukwe, dị ka e si kuziere unu, ndị jupụtara na-inye ekele.