Colossians 3:11 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nkewa ọ bụla adịghị nꞌime ndụ a. Ọ dịghị mkpa ebe onye ọ bụla si pụta, ma ọ bụ onye Juu ma ọ bụ onye mba ọzọ, ma ọ bụ onye e biri ugwu, ma ọ bụ onye a na-ebighị ugwu. Ọ dịkwaghị mkpa ma ọ bụ onye na-asụ asụsụ ọzọ, ma ọ bụ onye ime ọhịa, ma ọ bụ ohu, ma ọ bụkwanụ onye nwe onwe ya. Ihe dị mkpa bụ ma Kraịst o bikwa nꞌime onye ahụ, nꞌihi na Kraịst dịrị mmadụ nile.
Igbo 2006
ebe onye-Grik na onye-Ju, obibì-úgwù na ebìghi-úgwù, onye nāsu asusu ọzọ, onye Sitia, orù, onye nwere onwe-ya, nāpughi idi: ma Kraist bu ihe nile, di kwa nime madu nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nkewa ọbụla adịghị nʼime ndụ a. Ọ dịghị mkpa maọbụ onye Juu maọbụ onye mba ọzọ, maọbụ onye e biri ugwu, maọbụ onye a na-ebighị ugwu. Ọ dịkwaghị mkpa maọbụ onye na-asụ asụsụ ọzọ, ma ọ bu onye ime ọhịa, maọbụ onye Sitia, maọbụ ohu, ma ọ bụkwanụ onye nwe onwe ya. Ihe dị mkpa bụ na Kraịst bụ ihe niile, nọrọkwa nʼime ihe niile.