Colossians 3:13 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Jirinụ obi dị umeala na-anagide mmejọ ibe unu mejọrọ unu, ma gbagharakwa ha. Chetanụ na Chineke nꞌonwe ya gbaghaara unu, ya mere gbaghakwaranụ ibe unu.
Igbo 2006
nānagideritanu ibe-unu, were-kwa-nu amara b͕aghara onwe-unu, asi na onye ọ bula nwere ihe ita onye ọ bula uta; ọbuná dika Onye-nwe-ayi were amara b͕aghara unu, unu onwe-unu me kwa otú a:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Na-anagidenụ ibe unu, gbagharakwa mmejọ ọbụla ibe unu na-emejọ unu. Gbagharanụ dị ka Onyenwe anyị sị gbaghara unu.