Colossians 3:15 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ka udo ahụ Chineke na-enye bụrụ ihe ga-adị nꞌobi unu, ma pụtakwa ìhè na ndụ unu. Nꞌihi na ebe unu bụ akụkụ nke otu anụ ahụ ahụ, Chineke kpọrọ unu ka unu nọdụ nꞌudo. Mgbe nile kwa nọọnụ na-ekele Chineke ekele.
Igbo 2006
Ka udo nke Kraist nēkpezi kwa okwu n'obi-unu, nke akpọbata-kwa-ra unu nime ya n'otù aru; buru-kwa-nu ndi nēkele ekele.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ka udo Kraịst na-achị achị nʼime obi unu, ebe unu bụ akụkụ nke otu anụ ahụ ahụ, a kpọrọ unu ka unu nọdụ nʼudo. Mgbe niile, nọọnụ na-ekele.