Colossians 3:16 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Kwerenụ ka okwu Kraịst nwee ọnọdụ nꞌime unu, ime unu ndị bara ụba nꞌamamihe. Zikwanụ ndị ọzọ okwu amamihe a. Na-abụnụ abụ ọma na abụ na-ebuli mmụọ elu. Na-abụkunụ Onyenwe anyị abụ ndị a site nꞌobi jupụtara nꞌekele.
Igbo 2006
Kwenu ka okwu Kraist were àkù-ya nile biri nime unu n'amam-ihe nile; werenu abù ọma na ukwe na abù nke Mọ Nsọ nēzírita onwe-unu ihe, nādurita kwa onwe-unu ọdu, nime amara enyere unu nābùnu abù nime obi-unu nye Chineke.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ka okwu nke Kraịst biri nʼime unu nʼuju ya. Werenụ amamihe niile na-akụzirịta ibe unu ihe, ma na-adụrịtakwa ibe unu ọdụ. Werekwanụ abụ ọma na abụ nke ime mmụọ bụọrọ Chineke abụ ekele nʼobi unu.