Colossians 3:22 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ndị bụ ohu, na-asọpụrụnụ nna unu ukwu nꞌihe nile. Na-emenụ ihe ha gwara unu mee, ọ bụghị nanị mgbe ha nọ na-ele unu anya, kama werenụ obi unu nile jeere ha ozi, nꞌihi na unu bụ ndị kwesịrị ime ihe ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ.
Igbo 2006
Ndi-orù, nāṅanu nti okwu ndi bu ndi-nwe-unu n'uzọ anu-aru n'ihe nile; ghara iwere ibu-orù-n'anya nāṅa, dika ndi nēme otú ọ gātọ madu utọ, kama n'afọ-ofufo, nātu egwu Onye-nwe-ayi:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị bụ ohu, na-eruberenụ ndị bụ nna unu ukwu nʼanụ ahụ isi nʼihe niile, na-emenụ nke a, ọ bụghị naanị mgbe ha nọ na-ele unu anya, maọbụ mgbe unu chọrọ ịnata ihuọma, kama werenụ obi unu niile, na ịtụ egwu Onyenwe anyị rubere ha isi.