Colossians 4:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Epafras, odibo Kraịst Jisọs na onye bụkwa otu onye nꞌime ọgbakọ unu na-ekele unu. Oge nile ka ọ na-ekpe ekpere nꞌihi unu, na-arịọ ka unu guzosie ike nꞌokwukwe dị ka ndị tozuru oke, ndị maara ihe ha na-eme, ndị weere onwe ha nyefee nꞌaka ọchịchọ Chineke.
Igbo 2006
Epafras, onye bu otù onye n'etiti unu, orù nke Kraist Jisus, nēkele unu, nāb͕asi nb͕a ike n'ihi unu n'ekpere-ya nile mb͕e nile, ka unu we guzo dika ndi zuru okè ndi kwezuwo-kwa-ra ihe nile Chineke nāchọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Epafras, odibo Kraịst Jisọs na onye bụkwa otu onye nʼime ọgbakọ unu na-ekele unu. Oge niile ka ọ na-ekpe ekpere nʼihi unu, na-arịọ ka unu guzosie ike bụrụ ndị tozuru etozu na ndị kwesiri ike nʼọchịchọ niile nke Chineke.