Colossians 4:16 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe unu gụchara akwụkwọ a, hụnụ na a gụkwara ya na nzukọ Kraịst dị na Laodisia. Gụọkwanụ nꞌotu mgbe ahụ akwụkwọ nke m deere ndị Laodisia.
Igbo 2006
Ma mb͕e ọ bula agāgusi akwukwọ-ozi a n'etiti unu, menu ka agu kwa ya na nzukọ Kraist nke ndi Leọdisia; lezi-kwa-nu anya ka unu onwe-unu gu kwa akwukwọ ozi ahu si na Leọdisia bia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe unu gụchara akwụkwọ a, hụnụ na a gụkwara ya na nzukọ dị na Laodisia. Gụọkwanụ nʼotu mgbe ahụ akwụkwọ nke si na Laodisia bịa.