Daniel 1:10 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Onye-isi ndi-onozi we si Daniel, Mu onwem nātu egwu onye-nwem, bú eze, onye keputaworo ihe-oriri-unu na ihe-ọṅuṅu-unu: n'ihi na ọ̀ bú n'ihi gini ka ọ gāhu iru-unu ka ha b͕aruru kari iru umu-okoro ndi-ọb͕ọ-unu? unu ewe me ka eze nara isim na nrà.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma onyeozi a gwara Daniel, “Ana m atụ egwu nʼihi onyenwe m eze, onye kwuru ihe unu ga-eri na ihe unu ga-aṅụ. Ọ bụrụ na ọ hụ na unu tara ahụ karịa ndị ọgbọ unu ndị ọzọ, ndụ m ga-anọ na nsogbu nʼaka onye eze.”