Daniel 10:17 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Òrù nke onye-nwem nka gēsi kwa aṅa nwe ike ikpayere onye-nwem nka uka? ma mu onwem, site n'ub͕u a ike adighi-eguzogide kwa nimem, ume afọdughi kwa nimem.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Olee otu mụ bụ ohu gị ga-esi gwa gị okwu, Onyenwe m? Nʼihi na ike adịghịkwa nʼime m, enwekwaghị m ike iku ume.”