Daniel 11:14 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma na mb͕e ahu ka ọtutu madu gēguzo ọtọ imegide eze Ndida: ọzọ, umu nke ndi nēme ihe-ike n'etiti ndi-gi gēbuli onwe-ha ime ka ọhù ahu guzo; ma ha gāsu ngọngọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Nʼoge ahụ, ọtụtụ ndị ga-ebili imegide eze ndịda, Ụfọdụ ndị ọkpa aghara nʼetiti unu ga-enupukwa isi, ha ga-esi otu a mezuo ihe a ị hụrụ nʼọhụ, ma a ga-emeri ha.