Daniel 11:17 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ọ gēdo kwa iru-ya ibia abia n'ike nke ala-eze-ya nile, ndi ziri ezi gēso kwa ya; ọ gēme kwa ihe: ọ bu kwa ada ndinyom ka ọ gēnye ya, ibibi ya; ma ihe ahu agaghi-eguzo, ọ bughi kwa nke ya ka ọ gābu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ ga-ekpebi ịbịa nʼike nke alaeze ya niile, iji mee nke a, ya na eze nke ndịda ga-agba ndụ. Ọ ga-enyekwa ya nwaagbọghọ iji kwatuo alaeze ya, ma ebumnobi ya agaghị eguzo maọbụ baara ya uru.