Daniel 11:18 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ọ gēchighari kwa iru-ya le agwe-etiti nile, were ọtutu: ma otù ọchi-agha gēme ka ita-uta-ya kwusiri ya; e, ọ gēme kwa ka ita-uta-ya laghachikute ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ mesịrị nke a, ọ ga-eche ihu ya nʼobodo ndị ahụ niile dị nʼọnụ osimiri. Ọ ga-emerikwa ọtụtụ nʼime ha. Ma otu ọchịagha ga-alụso ya ọgụ, mee ka o jiri ọsọ gbaghachi nʼihere.