Daniel 11:31 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ogwe-aka ufọdu gēsite kwa n'akuku-ya guzo, me ka ebe nsọ ahu ghara idi nsọ, bú ebe ahu siri ike, ha gēwezuga kwa àjà-nsure-ọku ahu anēsure mb͕e dum, ha gēdo kwa ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ndị agha ya ga-ebili imerụ ebe ahụ e wusiri ike nke ụlọnsọ ukwu ahụ, kwụsịkwa aja nsure ọkụ nke a na-achụ kwa ụbọchị. Ha ga-ewuli ihe arụ nke na-eweta mbibi.