Daniel 3:15 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ub͕u a asi na unu ejikerewo na mb͕e unu gānu olu nke opì-ike, na nke ọ̀jà, na nke ubọ-akwara, na nke sackbut, na nke une, na nke dulcimer, na nke ubọ na opì nile di iche iche, unu gāda n'ala kpọ isi ala nye onyinyo ahu nke m'meworo, ọ di nma: ma asi na unu adighi-akpọ isi ala, n'otù mb͕e ahu ka agātubà unu n'etiti oké ọku nēnwu ajọ onwunwu; ònye bu kwa chi ahu nke gānaputa unu n'akam?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe unu nụrụ ụda opi, ọja, une na ụbọ akwara maọbụ ihe egwu ọzọ, ọ bụrụ na unu adaa nʼala kpọọ isiala nye oyiyi ahụ a kpụrụ akpụ, ihe niile ga-adị mma. Kama ọ bụrụ na unu ajụ ịkpọ isiala, a ga-atụnye unu ngwangwa nʼime ọkụ na-enwu ajọ onwunwu. Kedụ chi ahụ nke pụrụ ịnapụta unu site nʼaka m?”