Daniel 3:2 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Nebukadneza, bú eze, zi-kwa-ra ka achikọta ndi nọchiri anya eze, na ndi-isi, na ndi nāchi achi, na ndi-ikpé, na ndi-odozi-àkù, na ndi-ndum-ọdu, na ndi-odozi-okwu, na ndi nile nāchi ala anāchi achi, ibia n'irara onyinyo ahu nye, bú nke Nebukadneza, bú eze, guzobeworo ọtọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Eze Nebukadneza ziri ozi ka e zie ndị nnọchite anya eze niile, ndịisi, ndị na-achị achị, ndị ndụmọdụ ya niile, ndị na-elekọta ụlọakụ ya niile, ndị ọkaikpe, ndị maji na-edozi okwu na ọtụtụ ndị ọzọ nọkwa nʼisi ọchịchị akụkụ niile nke ala ahụ, ka ha bịa nʼụbọchị a ga-edo oyiyi ahụ nsọ bụ nke eze Nebukadneza guzobere.