Daniel 3:29 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
N'ihi ya anēsite n'akam nye iwu, si, na ndi ọ bula, ma-ọbu mba ọ bula, ma-ọbu asusu ọ bula, nke gēkwuhie megide Chineke nke Shedrak na Mishak na Abed-nego, agābọkasi ya, ọ bu kwa ulo-ya ka agēme ebe-ikpofu-ahihia: n'ihi na ọ dighi chi ọzọ nke puru inaputa otú a.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ana m enye iwu a taa, na-asị na onye ọbụla, maọbụ mba ọbụla, maọbụ asụsụ ọbụla, onye kwuru okwu ọjọọ megide Chineke Shedrak, Mishak na Abednego, a ga-etikpọkwa ụlọ onye ahụ, mee ka ọ ghọọ mkpọmkpọ ebe. Nʼihi na o nweghị chi ọzọ nke pụrụ ịzọpụta nʼụzọ dị otu a.”