Daniel 3:7 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
N'ihi nka, n'otù mb͕e ahu, mb͕e ndi nile di iche nuru olu nke opì-ike, na nke ọ̀jà, na nke ubọ-akwara, na nke sackbut, na nke une, na nke ubọ na opì nile di iche iche, ha we nāda n'ala, bú ndi nile di iche iche, na mba nile di iche iche, na ndi nile nāsu asusu di iche iche, ha we nākpọ isi ala nye onyinyo ọla-edo ahu nke Nebukadneza, bú eze, guzobere ọtọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ngwangwa ha nụrụ ụda opi ike, nke ọja, une ụbọ akwara, nke une na nke egwu dị iche iche, ndị niile si mba dị iche iche, ndị na-asụ asụsụ dị iche iche, dara nʼala kpọọ isiala nye oyiyi ọlaedo ahụ, nke eze bụ Nebukadneza guzobere.