Daniel 4:12 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Akwukwọ-ya mara nma, nkpuru-ya ri-kwa-ra nne, ihe-oriri izùru ihe nile di kwa ya: n'okpuru ya ka anu ọhia nēze ǹdò, ọ bu kwa n'alaka-ya ka nnunu nile nke elu-igwe nēbi, esite kwa na ya zù anu-aru nile, bú madu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Akwụkwọ ya dị mma ile anya, alaka ya jupụtakwara na mkpụrụ hiri nne, o gbokwara mkpa nri nye mmadụ niile. Ụmụ anụmanụ niile nke ọhịa na-abịakwa nʼokpuru ndo ya izuike. Ụmụ nnụnụ niile nke eluigwe na-ebikwa nʼalaka ya. Ọ bụkwa site na ya ka a na-azụ ihe niile dị ndụ nri.