Daniel 5:13 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Mb͕e ahu emere ka Daniel ba n'iru eze. Eze zara, si Daniel, Ọ̀ bu gi onwe-gi bu Daniel ahu, onye bu otù nime umu ndi nke Juda emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ndi eze ahu, bú nnam, chiputara na Juda?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, a kpọbatara Daniel nʼihu eze, eze sịrị Daniel, “Ọ bụ gị bụ Daniel, otu nʼime ndị Juda, ndị nna m dọtara nʼagha site na Juda?