Daniel 5:7 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Eze kpọsiri nkpu ike, si ka eme ka ndi-dibia na ndi Kaldea na ndi nekè elu-igwe bata. Eze zara, si ndi-amam-ihe nke Babilon, Onye ọ bula nke gāgu ihe a edere, kọ-kwa-ram isi-ya, uwe-ododo ka o gēyi, iyab͕a ọla-edo gādi kwa n'olu-ya, ọ bu kwa dika otù nime ndi-eze atọ n'ala-eze a ka ọ gāchi achi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Eze kpọrọ mkpu ka a kpọbata ndị dibịa niile na ndị Kaldịa, na ndị na-akọwa maka njegharị nke kpakpando. Mgbe ahụ eze sịrị ndị ikom amamihe nke Babilọn, “Onye ọbụla nwere ike gụọ ihe ahụ e dere, nke nwekwara ike ịkọwara m ihe ọ pụtara, ka a ga-eyikwasị uwe odo odo nke ndị eze. A ga-anyakwasị ya ihe olu ọlaedo. A ga-emekwa ya ka ọ bụrụ onye ọchịchị nke atọ nʼalaeze a.”