Daniel 7:19 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Mb͕e ahu ka m'chọrọ ima ihe bu ezi-okwu bayere anu nke-anọ ahu nke puru iche nime ha nile, nke dikarisiri egwu, nke ezé-ya nile bu ígwè, mbọ-ya nile buru ọla; nke ripiara, tapia, were ukwu-ya nile zọtọ nke fọduru;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Mgbe ahụ, achọrọ m ịmata ihe banyere anụ ọhịa nke anọ ahụ, nke ahụ gbara iche site nʼanụ ọhịa ndị ọzọ, na-eyikwa oke egwu, nke nwere eze dịka igwe, na mbọ yiri nke e ji bronz kpụọ. Nke ahụ na-adọwasị ndị mmadụ, na nke na-azọgbukwa ndị fọdụrụ.