Daniel 8:2 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
M'we hu n'ọhù ahu; o we rue, mb͕e m'nāhu, na mu onwem nọ na Shushan, bú ulo uku eze nke di n'Ilam, bú ala anāchi achi; m'we hu n'ọhù ahu, ma le, mu onwem nọ n'akuku osimiri Ulai.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼime ọhụ, ahụrụ m onwe m nʼobodo Susa, nke bụ obodo ukwu ebe eze nwere isi ọchịchị ya, nʼobodo dị na mpaghara Elam. Eguzokwara m nʼakụkụ osimiri Ulai.