Daniel 8:24 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ike-ya gēsi kwa ike, ma ọ bughi n'ike nke aka ya; ọ gēbibi kwa n'uzọ di ebube, ihe gāga-kwa-ra ya nke-ọma, ọ gēme kwa ihe: ọ gēbibi kwa ndi nwere ume na ndi ahu, bú ndi nsọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ ga-adị ike nke ukwuu, ma ọ bụghị nʼike onwe ya, ọ ga-eweta mbibi ga-eju anya. Ihe niile o metụrụ aka ga-agara ya nke ọma. Ọ ga-alakwa ndị dị ike na ndị nsọ nʼiyi.