Daniel 8:4 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ahurum ebulu ahu ka ọ nāsọ mpi n'akuku Ọdida-anyanwu, na n'akuku Ugwu, na n'akuku Ndida; ma ọ dighi anu ọ bula nēguzo n'iru ya, ọ dighi kwa onye nānaputa ihe n'aka-ya; ma ọ neme dika ọ tọrọ ya utọ, me onwe-ya uku.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe m na-ele anya, ebule ahụ malitere iji mpi ya na-asọ ihe o bụla dị nʼọdịda anyanwụ na nʼugwu nakwa na ndịda. O nweghị anụ ọbụla nwere ike iguzogide ya, o nwekwaghị onye ọbụla pụrụ inyere ndị ọ lụsoro ọgụ aka. O mere ihe ọbụla masịrị ya si otu a dị ukwuu.