Daniel 9:17 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma ub͕u a, Chineke-ayi, ge nti n'ekpere orù-Gi na n'aririọ-amara-ya nile, me iru-Gi ka ọ mukwasi ebe nsọ Gi nke tọb͕ọrọ n'efu, n'ihi Onye-nwe-ayi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ma ugbu a, Chineke anyị, biko nụrụ ekpere na arịrịọ ohu gị. Nʼihi aha gị, Onyenwe anyị jiri amara mee ka ihe si nʼihu gị mụkwasị ụlọnsọ gị nke tọgbọrọ nʼefu.