Daniel 9:2 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
n'arọ mbu nke ọbubu-eze-ya ka mu onwem, bú Daniel, jiri akwukwọ nile ayi ghọta ọnu-ọgugu arọ ahu, nke okwu Jehova ruru Jeremaia, bú onye-amuma, nti bayere ha, imezuru nkpọnkpọ ebe nile nke Jerusalem, bú ọgu arọ atọ na iri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
nʼafọ mbụ nke ọchịchị ya, ka mụ onwe m, bụ Daniel ghọtara site nʼakwụkwọ, dịka okwu Onyenwe anyị nyere Jeremaya onye amụma, nke ga-emezu mgbe Jerusalem ga-anọ na mbibi iri afọ asaa.