Deuteronomy 11:25 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ọ dighi nwoke ọ bula gēguzo onwe-ya n'iru unu: ujọ-unu na egwu-unu ka Jehova, bú Chineke-unu, gātukwasi n'iru ala ahu nile nke unu gāzọkwasi, dika Ọ gwaworo unu okwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ imegide unu nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-emenye ha egwu na ụjọ nʼafọ nʼụzọ ọbụla unu na-aga, dịka o kwere na nkwa.