Deuteronomy 12:27 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
i gāchu kwa aja-nsure-ọku-gi nile, anu na ọbara, n'elu ebe-ichu-àjà nke Jehova, bú Chineke-gi: agāwukwasi kwa ọbara nke àjà-gi nile n'ebe-ichu-àjà nke Jehova, bú Chineke-gi, ma i gēri anu-ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Chụọ aja nsure ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị Chineke gị, ma anụ na ọbara. A ghaghị ịwụsa ọbara anụ ahụ e ji chụọ aja nʼakụkụ ebe nchụaja nke Onyenwe anyị Chineke gị. Ma i nwere ike rie anụ ahụ e ji chụọ aja.