Deuteronomy 12:3 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
unu gākwatu kwa ebe-ichu-àjà nile ha, tupia ogidi nile ha, sure Asherim-ha n'ọku, b͕utu arusi nile apiri api nke chi nile ha, we me ka aha-ha lapu n'iyì n'ebe ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Kwatuokwanụ ebe ịchụ aja ha niile, tijisie ogidi nsọ ha niile, kpọọkwa osisi Ashera ha ọkụ, gbutukwaanụ arụsị niile a apịrị apị nke chi niile ha. Kpochapụkwanụ aha ha niile site nʼebe niile ahụ.