Deuteronomy 13:18 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
mb͕e i gēge kwa olu Jehova, bú Chineke-gi, nti, idebe ihe nile Ọ nyere n'iwu nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, ka i we me ihe ziri ezi n'anya Jehova, bú Chineke-gi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onyenwe anyị Chineke gị ga-eme ihe ndị a ma ọ bụrụ na ị na-erubere ya isi, na-edebezukwa iwu ya niile, nke m na-enye gị taa, ma na-eme ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị.