Deuteronomy 14:26 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
i gēnye kwa ego ahu n'ihe ọ bula nke agu ya nāgu nkpuru-obi-gi, n'ìgwè ehi, ma-ọbu n'ìgwè ewu na aturu, ma-ọbu na manya-vine, ma-ọbu n'ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, ma-ọbu n'ihe ọ bula nkpuru-obi-gi nāriọ n'aka-gi: i gēri kwa ihe n'ebe ahu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, ṅuri kwa ọṅu, gi onwe-gi na ulo-gi:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Were ọlaọcha ahụ zụọ ihe ọbụla ị chọrọ: ehi, na atụrụ, na mmanya, maọbụ mmanya siri ike na-aba nʼanya maọbụ ihe ọbụla ọzọ nke ị chọrọ. Mgbe ahụ, gị na ezinaụlọ gị ga-eri nri nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị, ṅụrịakwa ọṅụ.