Deuteronomy 17:20 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
ka obi-ya we ghara idi elu kari umu-nne-ya, ka ọ ghara kwa isi n'ihe enyere n'iwu wezuga onwe-ya, n'aka-nri, ma-ọbu n'aka-ekpe: ka o we me ka ubọchi-ya di anya n'ala-eze-ya, ya onwe-ya na umu-ya, n'etiti Israel.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ịgụ akwụkwọ iwu a mgbe niile ga-eme ka ọ mata na o nweghị ụzọ o si dị elu karịa ụmụnna ya. Ọ ga-emekwa ka ọ ghara iwezuga onwe ya site nʼiwu a nʼụzọ ọbụla. Mgbe ahụ, ya onwe ya, na ụmụ ụmụ ya ga-achị alaeze Izrel ogologo oge.