Deuteronomy 17:8 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Mb͕e okwu ọ bula gākari gi n'ikpé, n'etiti ọbara na ọbara, ma-ọbu n'etiti okwu-ikpé na okwu-ikpé, ma-ọbu n'etiti otiti-ihe na otiti-ihe, bú okwu nile nke ise-okwu nime ọnu-uzọ-ama-gi nile: i gēbili kwa, rigorue ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na unu enwee okwu siri ike na mkpebi, dịka igbu ọchụ, maọbụ okwu na ụka metụtara mmadụ, maọbụ ịlụ ọgụ nke mmerụ ahụ dapụtara nʼime ya, ihe unu ga-eme bụ iweta ikpe ahụ nʼebe obibi Onyenwe anyị Chineke gị họpụtara,