Deuteronomy 2:8 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ayi we si n'ala umu-nne-ayi, bú umu Isọ, ndi bi na Sia, gabiga, site n'uzọ Araba, site n'Ilat, site kwa n'Ezion-geba. Ayi we che iru, gabiga n'uzọ ọzara Moab.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, anyị sitere nʼala ụmụnna anyị bụ ụmụ Ịsọ, ndị bi na Sia gafee. Anyị hapụkwara ụzọ Araba nke si Elat na Eziọn Geba, tụgharịa gawa elu elu ụzọ ọzara Moab.