Deuteronomy 22:17 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
ma, le, nwoke a ebowo ya ebubo ihere, si, Achọtaghm n'aru nwa-gi nwayi ihe nēgosi na ọ bu nwayi nāmaghi nwoke; ma ndia bu ihe nēgosi na nwam nwayi bu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke. Ha gāb͕asa kwa uwe-nb͕okwasi-ya n'iru ndi-okenye obodo ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ugbu a, o boola ya ebubo ihere, sị, ‘Achọpụtaghị m ihe ọbụla nʼahụ nwa gị nwanyị a ihe na-egosi na ọ maghị nwoke.’ Ma nke a bụ ihe ngosi na ada anyị amaghị nwoke.” Mgbe ahụ ndị mụrụ ya ga-agbasapụ akwa ahụ nʼihu ndị okenye obodo ahụ.