Deuteronomy 25:15 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Nkume-isì-ihe zuru okè, nke zi-kwa-ra ezi, ka i gēnwe; ephah zuru okè, nke zi-kwa-ra ezi, ka i gēnwe: ka ubọchi-gi we di anya n'elu ala nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ị ghaghị inwe ezi ihe ọtụtụ na nke zuru ezu. Nke a ga-eme ka ndụ gị dị ogologo, dịkwa mma nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.