Deuteronomy 26:13 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
i gāsi kwa n'iru Jehova, bú Chineke-gi, Ekpochapuwom ihe nsọ ahu n'ulom, ọzọ kwa, enyewom ya ndi Livai, nye kwa ọbìa, nye kwa nwa-nb͕ei, nye kwa nwayi di-ya nwuru, dika ihe nile I nyere n'iwu si di nke I nyerem n'iwu: agabigaghm ihe nile I nyere n'iwu, echezọghkwam:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ị ga-ekwupụta nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị sị, “Esitela m nʼụlọ wepụ oke ahụ dị nsọ, nye ha ndị Livayị, na ndị ọbịa, na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ, dịka i nyere m nʼiwu, enupughị m isi maọbụ chefuo iwu gị ọbụla.