Deuteronomy 28:20 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Jehova gēzikwasi gi ọbubu-ọnu, na ob͕ub͕a-aghara, na ibasi-nba-ike, nime nseti aka-gi nile nke i nēme, rue mb͕e agēkpochapu gi, ru kwa mb͕e i gāla n'iyì ngwa ngwa; n'ihi ihe ọjọ nke omume-gi nile nke i ji rapum.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onyenwe anyị ga-ezidata nʼisi gị ọbụbụ ọnụ, na ọgbaaghara, tinyere nkọcha nʼihe niile nke i tinyere aka gị, tutu ruo mgbe ị ghọrọ onye e bibiri ebibi bụrụ onye lara nʼiyi na mberede, nʼihi ihe ọjọọ niile i mere site nʼịhapụ m.