Deuteronomy 3:21 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Joshua ka m'nye-kwa-ra iwu na mb͕e ahu, si, Anya-gi abua nāhu ihe nile Jehova, bú Chineke-unu, meworo eze abua ndia: otú a ka Jehova gēme ala-eze nile ebe gi onwe-gi nāgabiga.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼoge ahụ, agwara m Joshua okwu sị, “I jirila anya gị hụ ihe Onyenwe anyị Chineke gị mere eze abụọ ndị a. Otu a ka ọ ga-emekwa alaeze niile dị nʼofe Jọdan ebe unu na-aga.