Deuteronomy 31:12 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Kpọkọta ndi Israel, bú ndikom, na ndinyom, na umu-ntakiri, na ọbìa-gi nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, ka ha we nu, ka ha we muta kwa, we tua egwu Jehova, bú Chineke-unu, lezi kwa anya ime okwu nile nke iwu a;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Kpọkọta mmadụ niile nʼotu ebe, ndị ikom, na ndị inyom na ụmụntakịrị, na ndị ọbịa bi nʼetiti obodo unu, ka ha nụrụ, ma mụta ịtụ egwu Onyenwe anyị Chineke unu na ilezi anya ịgbaso okwu niile dị nʼiwu a.