Deuteronomy 31:20 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
N'ihi na mb͕e M'gēmewori ka ha ba n'ala ahu nke M'ṅuru ndi bu nna-ha iyi, bú ala miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya; mb͕e ha gēriwo-kwa-ri ihe, afọ eju kwa ha, ha we ma abuba; ha gēche kwa chi ọzọ iru, fè ha òfùfè, we leliam anya, mebi kwa ọb͕ub͕a-ndum.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe m mere ka ha bata nʼala ahụ m kwere nna nna ha na nkwa, ala ahụ mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-erugharị nʼime ya, mgbe ha rijukwara afọ, baakwa ụba, ha ga-ebido ife chi ọzọ ofufe, jụ m, ma mebikwaa ọgbụgba ndụ m.