Deuteronomy 31:21 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
O gēru kwa, mb͕e ọtutu ihe ọjọ na ahuhu gāchọta ha, na abù a gāb͕a àmà n'iru ha dika ihe-àmà; n'ihi na agaghi-echezọ ya pua n'ọnu nkpuru-ha: n'ihi na amawom ncheputa-ha nke ndi ahu nēme ta, tutu Mu eme ka ha ba n'ala ahu nke M'ṅuru iyi inye ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma mgbe ọtụtụ ihe ọdachi na ahụhụ ga-abịakwasị ha, abụ a ga-eme ka ha cheta ihe mere nsogbu ha niile ji bịakwasị ha, nʼihi na abụ a ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Amaara m nke ọma ugbu a, ọ bụladị tupu ha abanye nʼala ahụ m kwere nkwa inye ha site nʼịṅụ iyi, ụdị mmadụ ha bụ.”