Deuteronomy 33:29 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Onye ihe nile nāgara nke-ọma ka i bu, Israel: Ònye di ka gi? bú ndi Jehova zọputaworo, Onye bu ọta nke iye-aka-gi, Onye bu kwa mma-agha nke nbili-elu-gi! Ndi-iro-gi gērube kwa isi aghughọ n'okpuru gi; Gi onwe-gi gāzọkwasi kwa ebe di elu nke ha ukwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye a gọziri agọzi ka ị bụ, gị Izrel, onye dị ka gị ndị Onyenwe anyị zọpụtara? Ọ bụ ọta gị na onye inyeaka gị, na mma agha gị dị ebube. Ndị iro gị ga-eji egwu daa nʼihu gị, ị ga-azọdakwa ebe ha niile dị elu.”