Deuteronomy 5:14 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
ma ubọchi nke-asa bu ubọchi-izu-ike nke Jehova, bú Chineke-gi, nwere: i gaghi-eje ozi ọ bula nime ya, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na ehi-gi, na inyinya-ibu-gi, na anu-ulo-gi nile, na ọbìa-gi nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula; ka orù-gi nwoke na orù-gi nwayi we zuru ike dika gi onwe-gi nēzu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izuike nke Onyenwe anyị Chineke gị. Ị gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, gị onwe gị, nwa gị nwoke na nwa gị nwanyị, onye ọrụ gị nwoke, onye ọrụ gị nwanyị, ehi gị, ịnyịnya ibu gị maọbụ anụ ụlọ gị ọbụla, ọ bụladị onye ọbịa bi nʼobodo gị, ka ohu gị nwoke na ohu gị nwanyị zuru ike dịka gị onwe gị si ezu ike.