Deuteronomy 5:16 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Sọpuru nna-gi na nne-gi, dika Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi iwu: ka ubọchi-gi we di anya, ka ọ we di-kwa-ra gi nma, n'elu ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Sọpụrụ nne gị na nna gị, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu, ka ụbọchị ndụ gị dị ogologo, ka ihe dịkwara gị mma nʼala ahụ nke Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.